Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:19 - Bible Nso

19 Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n'ebe m'nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:19
25 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Gini ka ha huru n'ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n'ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n'àkùm nile nke m'nēmeghi ka ha hu.


Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.


Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem: M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile; Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem. Selah


N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile.


Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.


M'gēme ka madu di ukọ kari ọla-edo anuchara anucha, ọbuná madu efu kari ọla-edo ọma nke Ofia.


Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.


M'we kpere Jehova, bú Chinekem, kwuputa, si, Biko, Onye-nwe-ayi, bú Chineke ahu Nke di uku di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya;


Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a?


Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.


n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa.


n'idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu,


si ka agadi-ndikom nwe anya-udo, kwesiri nsọpuru, nwe uche zuru okè, nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, nime ihu-n'anya, nime ntachi-obi:


n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.


Ekan we za Joshua, si, N'ezi-okwu mu onwem emehiewo megide Jehova, bú Chineke Israel, otú a na otú a ka m'mewo-kwa-ra:


Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.


Sọl we si Jonatan, Gosim ihe i meworo. Jonatan we gosi ya, si, N'ezie ewerem ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'akam detu nwantī manu-aṅu ire; lem, m'gānwu.


Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n'aru unu, na n'aru chi nile unu, na n'ala-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan