Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:15 - Bible Nso

15 Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n'ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n'ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n'ihi na o mewo ihe-nzuzu n'Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:15
11 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a.


Ma mu onwem, òle ebe m'gēme ka ita-utam la? ma gi onwe-gi, i gādi ka otù onye nime ndi-nzuzu n'israel. Ma ub͕u a, biko, gwa eze okwu; n'ihi na ọ gaghi-eb͕ochim n'ebe i nọ.


Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha.


Joshua we bilie n'isi-ututu, me ka Israel biarue nso n'ebo nile ha; ewe nwude ebo Juda:


ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n'Israel.


Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua.


M'we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n'ọhia nile nke ala-nketa Israel: n'ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n'Israel.


Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n'ihi na m'gaghi-emejọ gi ọzọ, n'ihi na ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n'amaghi-ama.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan