Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:13 - Bible Nso

13 Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n'etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n'iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n'etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:13
13 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Jekob biakwasiri ndi eb͕uru eb͕u, luta obodo ahu n'agha, n'ihi na ha merururi nwa-nne-ha nwayi.


Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gāzọda umu Juda na Jerusalem ka ha ghọrọ unu ndi-orù na ndinyom nēje ozi: ma unu onwe-unu, ìhe ikpe-ọmuma adighi kwa n'etiti unu n'ebe Jehova, bú Chineke-unu, nọ?


Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n'anya nwa-nna-gi.


Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà;


Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n'ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n'etiti unu.


Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru.


Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan