Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:11 - Bible Nso

11 Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye Onyenwe anyị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:11
24 Iomraidhean Croise  

n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, we gabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, bú ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere n'iwu, ha anughi kwa ya, ha emeghi kwa ya.


Ọ biarue ugwu ntà ahu, nara ha n'aka-ha, tiye ha n ulo: o zilaga ndikom ahu, ha we la.


Emeruwo kwa uwa n'okpuru ndi bi ya; n'ihi na ha agabigawo iwu nile, b͕anwe ukpuru, mebie ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.


ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n'ubọchi M'jidere ha n'aka ime ka ha si n'ala Ijipt puta; n'ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma ndi ahu agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n'ebe ahu ka ha ghọb͕uworom.


Mb͕e madu gēmekpu ihe-nmekpu, mehie n'amaghi-ama megide ihe nsọ nile nke Jehova; ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè si n'ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di n'ọla-ọcha shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma:


Ndia, hà nile agaghi-atu ilu megide ya, na okwu miri emi, ọbuná okwu omimi di iche iche, bayere ya, si, Ahuhu diri onye ahu nke nēme ka ihe nābughi nke ya ba uba! rùe ole mb͕e? onye ji ihe-ibe ebob͕u onwe-ya!


Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.


Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.


Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n'ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi.


Mb͕e agāhuta n'etiti gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, nwoke ma-ọbu nwayi, nke nēme ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, n'igabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya,


Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.


Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n'iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n'aru unu, unu gālapu kwa n'iyì ngwa ngwa n'ezi ala ahu nke O nyeworo unu.


Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.


Jehova we si Joshua, Gi bilie; n'ìhi gini bu nka na i nāda kpu iru-gi n'ala?


Iwe Jehova we di ọku megide Israel; O we si, N'ihi na mba nka agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyeworo ndi bu nna-ha n'iwu, n'ihi na ha egeghi kwa nti olum;


Sọl we si, Biaruenu nso n'ebe a, unu ndi-isi nile nke ndi Israel: mara-kwa-nu hu ihe nke nmehie a diworo nime ya ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan