Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 6:24 - Bible Nso

24 Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 6:24
13 Iomraidhean Croise  

Ha we gosi Devid, o ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.


o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.


Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek.


Ha sure-kwa-ra obodo-ha nile n'ebe-obibi nile ha, na ebe-ulo-ikwū-ha nile, n'ọku.


I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.


Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;


Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n'obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa.


Ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu nile nke di nime ya, ha wezugara ha ka ebibie ha: ọ dighi onye nēku ume fọduru: o sure Hezoa n'ọku.


Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.


Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n'etiti Israel, rue ta; n'ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko.


Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta.


Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.


N'ihi nka ọ bu n'otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n'ọku; n'ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan