Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 6:23 - Bible Nso

23 Umu-okorọbia ahu, bú ndi-nledo, we ba nime, me ka Rehab, na nna-ya, na nne-ya, na umu-nne-ya, na ihe nile ọ nwere, puta, ab͕uru-ya nile ka ha me-kwa-ra ka ha puta; ha we me ka ha nọdu n'azu ọmuma-ulo-ikwū Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 6:23
15 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi:


Eleghi anya ọgu ndi ezi omume abua na iri di n'obodo ahu: ọ̀ gābu ezie na i gēkpochapu ebe ahu ghara ib͕aghara ya n'ihi ọgu ndi ezi omume abua na iri nọ nime ya?


O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n'etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.


Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n'aru-unu n'ubọchi nke-atọ na n'ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n'agha.


o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha:


si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ.


N'ihi na òle ihe bu nkem ikpe ndi nọ n'èzí ikpé? Ọ̀ bughi ndi nọ n'ime ka unu onwe-unu nēkpe?


na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa.


Okwukwe ka Rehab, bú nwanyi nākwa iko, ji ghara iso ndi nēkweyeghi ekweye lakọ n'iyi, ebe o were udo nata ndi ledoro obodo ahu anya.


Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe.


na unu gēme kwa ka nnam, na nnem, na umu-nnem ndinyom, na ihe nile ha nwere, di ndu, na unu gānaputa kwa ndu-ayi n'ọnwu.


O we si ha, Jenu n'ugwu, ka ndi nāchu unu we ghara izute unu; zo-kwa-nu onwe-unu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu unu gālaghachi: emesi kwa unu gēje ije-unu.


Le, mb͕e ayi onwe-ayi gaje ibata n'ala nka, i gēkegide eriri ogho uhie a nime window nke i ji weda ayi: nna-gi, na nne-gi, na umu-nne-gi, na ulo nna-gi nile, ka i gāchikọta-kwa-ra onwe-gi n'ulo a.


Ọ we gosi ha nbata obodo ahu, ha we were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu; ma ha zipuru nwoke ahu na ab͕uru-ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan