Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 6:19 - Bible Nso

19 Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye Onyenwe anyị. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 6:19
25 Iomraidhean Croise  

ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo nke o doro nsọ site na mba nile nke o budara;


o wepu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze; ọbuná ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.


Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n'ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Jehova.


O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.


Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek.


Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile.


Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ.


Site n'agha-ha nile, bú site n'ihe-nkwata, ka ha doro ya nsọ ime ka ulo Jehova di ike.


Ya na ihe nile Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na Sọl nwa Kish, na Abnea nwa Nea, na Joab nwa Zeruaia, doro nsọ; onye ọ bula nke doro ihe nsọ, ọ di n'aka Shelomit na umu-nne-ya.


na ihe-atù ihe nile nke di n'aka-ya site na Mọ Nsọ bayere ogige nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra ime-ulo nile di buruburu, bayere ulo-àkù nile nke ulo Chineke, baye-kwa-ra ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile:


Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.


Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n'uzọ iri, na ihe nsọ nile, n'ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua.


Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n'uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n'uzọ iri nime otù uzọ n'uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù.


Ebed-melek we chiri ndikom ahu n'aka-ya, ba n'ulo eze n'okpuru ulo-àkù, chiputa n'ebe ahu nkirika ákwà nke dọkara adọka na nkirika ákwà nke kara nká, o we chiri udọ̀ radara ha Jeremaia n'olùlù ahu.


Ma n'arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova.


Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.


Ha we chiri ihe nile akwatara n'agha, na ihe-nweta nile, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu.


Ha we wetara Moses, weta-kwa-ra Eleeza, bú onye-nchu-àjà, weta-kwa-ra nzukọ umu Israel, ndi adọtara n'agha, na ihe-nweta, na ihe akwatara n'agha, rue ọmuma-ulo-ikwū, rue ala ihe nādighi nke Moab nke di n'akuku Jọdan na nso Jeriko.


otú ọ di, ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, na b͕amb͕am, na opù,


Ndi-isi-nchu-àjà we nara ego ọla-ọcha nile, si, O zighi ezi n'iwu itubà ha n'ebe anēdebe ihe enyere Chineke, ebe ọ bu ọnu-ahia ọbara.


O we nọdu n'ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n'ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne.


Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan