Joshua 6:18 - Bible Nso18 Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a18 Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile. Faic an caibideil |
Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n'aru Egag, na n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n'aru umu-aturu, na n'aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya.