Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 6:17 - Bible Nso

17 Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 6:17
26 Iomraidhean Croise  

M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi.


ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n'ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.


Mma-agha Jehova juputara n'ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n'abuba, site n'ọbara umu-aturu na nkpi, site n'abuba nke akuru ebulu: n'ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n'ala Edom.


Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si nnunu nile di iche iche, si kwa anu ọhia nile ọ bula, Chikọtanu onwe-unu, bia; zukọputanu n'akuku nile di buruburu, n'ihi àjàm nke Mu onwem nāchuru unu, bú àjà di uku M'nāchu n'elu ugwu nile nke Israel, ka unu we rie anu, ṅu kwa ọbara.


ma ala-ubi ahu, n'òpùpù-ya nime jubile, gādiri Jehova nsọ, dika ala-ubi nke ewezugara ka ebibie ya; onye-nchu-àjà gēnwe ihe-onwunwe ala-ubi ahu.


Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.


Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.


Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.


kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:


N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.


ma iwu ahu esiteghi n'okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha.


N'ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu:


Okwukwe ka Rehab, bú nwanyi nākwa iko, ji ghara iso ndi nēkweyeghi ekweye lakọ n'iyi, ebe o were udo nata ndi ledoro obodo ahu anya.


n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.


Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche?


Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.


Ha we je, biarue ugwu ahu, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu ha laghachiri: ndi nāchu ha we chọ ha n'uzọ ahu nile, ma ha achọtaghi ha.


Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Sọl we si ndi-Kinait, Jenu, wezuga onwe-unu, si n'etiti ndi Amalek rida, ka m'we ghara ikpochapu unu na ha: n'ihi na unu onwe-unu mere umu Israel nile ebere, mb͕e ha siri n'Ijipt rigota. Ndi-Kinait we si n'etiti Amalek wezuga onwe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan