Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 5:13 - Bible Nso

13 O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 5:13
24 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie;


o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,


Jekob we teta n'ura-ya, si, N'ezie Jehova nọ n'ebe a; ma mu onwem amaghi ya.


Jekob we welie anya-ya abua, hu, ma le, Isọ nābia, ya na nnù ndikom. Ọ we ke umu-ya nye Lia, nye kwa Rechel, nye kwa ndinyom abua ahu nēje ozi.


Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara.


N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.


Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n'ọbọ-ya.


Ma Devid apughi ije n'iru ya iju Chineke ase: n'ihi na ọ turu egwu nke-uku n'ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.


N'ihi na mọ-ozim ganēje n'iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M'gēzopu kwa ha n'uwa.


m'we welie anyam abua, hu, ma, le, otù onye yiri uwe ọcha, onye ekere ihe-ọkiké ọla-edo ọma nke Ufaz n'úkwù-ya:


M'we welie anyam, hu, ma, le, otù ebulu nēguzo n'iru osimiri ahu nke nwere mpi abua: mpi abua ahu di kwa elu, ma otù di elu kari ibe-ya: ma nke ka elu kpe azu pute.


Ahurum n'abali, ma, le otù onye nke nānọkwasi inyinya nācha uhie uhie, onye ahu nēguzo kwa n'etiti osisi myrtle nke di n'ebe miri emi; n'azu ya ka inyinya di iche iche guzoro, nke nācha uhie uhie, na nke nācha dika manu, na nke nācha ọcha.


Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n'uzọ, je n'ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n'uzọ.


Jehova we saghe anya Belam abua, o we hu mọ-ozi nke Jehova ka ọ nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: o we rube isi, kpọ isi ala n'iru-ya.


Mb͕e ha nēlegide anya n'elu-igwe ka Ọ nāga n'elu, le, ndikom abua we guzo ha nso yiri uwe ọcha;


Jehova we si Joshua, Le, enyewom Jeriko, na eze-ya, na ndi-dike nile, bú dinkpà, n'aka-gi.


n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n'ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n'obi-Ya gburugburu.


Manoa we bilie, jeso nwunye-ya, biakute nwoke ahu, si ya, Gi onwe-gi, ì bu nwoke ahu nke gwara nwayi a okwu? O we si, Mu ka ọ bu.


Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan