Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 5:10 - Bible Nso

10 Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 5:10
14 Iomraidhean Croise  

Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n'ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di.


Otú a ka unu gēri ya; n'iji ihe-ọkiké ke n'úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n'ukwù, na nkpa-n'aka-unu n'aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu.


N'onwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n'anyasi.


ọ gābu-kwa-ra unu ihe-ndebe rue ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nka: nkpọkọta nile nke nzukọ Israel gēb͕u ya n'etiti ehihie na anyasi.


Usu-ndi-agha nke ndi Kaldea we chua ha n'azu; rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ha we jide ya, me ka ọ rigokuru Nebukadreza, bú eze Babilon, rue Ribla n'ala Hemat, o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi ihe di iche iche nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, je biri n'ala ọzọ n'ehihie n'anya-ha; i gēsi kwa n'ọnọdu-gi je biri n'ebe ọzọ n'anya-ha: eleghi anya ha gāhu, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.


Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova.


Ndi Israel we si na Jọdan rigota n'ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko.


Ha we rie ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu n'echi nke ngabiga ahu, bú achicha ekoghi-eko na ọka aṅara n'ọku, n'otù ubọchi ahu.


Ha we jekuru Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū na Gilgal, si ya, si kwa ndikom Israel, Ala di anya ka ayi si bia: ma ub͕u a ka ayi na unu b͕a ndu.


O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n'ebe ahu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan