Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 4:7 - Bible Nso

7 unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 4:7
11 Iomraidhean Croise  

Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile: Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.


Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi.


I gētiye kwa nkume abua ahu n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n'iru Jehova n'elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta.


I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.


Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;


iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.


O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu.


kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam.


Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n'ala; n'ihi na i mere ngwa ngwa si n'ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n'ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi.


ka nka we buru ihe-iriba-ama n'etiti unu, mb͕e umu-unu gāju ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi nkume ndia n'ebe unu nọ?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan