Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 3:8 - Bible Nso

8 Gi onwe-gi gēnye kwa ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu iwu, si, Mb͕e unu gābiaru nsọtu miri Jọdan, unu gēguzo na Jọdan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 3:8
20 Iomraidhean Croise  

Elaija we si ya, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jọdan. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha abua we je.


Ha we chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba, dika ihe ahu si di nke eze nyere n'iwu, site n'okwu, ime ka ulo Jehova di ọcha.


Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel.


Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala.


Aka Chineke di kwa na Juda inye ha otù obi, ime ihe eze na ndi-isi nyere n'iwu site n'okwu Jehova.


M'we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.


Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m'we me ka ọ b͕apu n'ebe m'nọ.


Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.


Ndi-nchu-aja ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we guzo n'ala-akọrọ n'etiti Jọdan, Israel nile we nagabiga n'ala-akọrọ, rue mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan.


ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n'ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya.


Jehova we si Joshua, Ta ka M'gāmalite ime ka i di uku n'anya Israel nile, ka ha we mara na otú M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi.


Joshua we si umu Israel, Bianu nso ebe a, nuru okwu nile nke Jehova, bú Chineke-unu.


O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan