Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 3:7 - Bible Nso

7 Jehova we si Joshua, Ta ka M'gāmalite ime ka i di uku n'anya Israel nile, ka ha we mara na otú M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 3:7
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka Solomon di uku ri nne n'anya Israel nile, O we tiyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasighi eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ.


Solomon nwa Devid we me onwe-ya ka ọ di ike n'ala-eze ya, Jehova, bú Chineke-ya, we nọyere ya, me ka ọ di uku ri nne.


Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku, Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,


I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.


Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto:


dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.


Dika ihe nile si di nke ayi gere Moses nti nime ya, otú a ka ayi gēge gi nti: nání, Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, dika Ọ nọyere Moses.


Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi.


Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.


Joshua we gwa ndi-nchu-àjà okwu, si, Bulienu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu-ahu, gabiga n'iru ndi Israel. Ha we bulie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, we nēje n'iru ndi Israel.


Gi onwe-gi gēnye kwa ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu iwu, si, Mb͕e unu gābiaru nsọtu miri Jọdan, unu gēguzo na Jọdan.


N'ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n'anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan