Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 3:17 - Bible Nso

17 Ndi-nchu-aja ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we guzo n'ala-akọrọ n'etiti Jọdan, Israel nile we nagabiga n'ala-akọrọ, rue mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 3:17
14 Iomraidhean Croise  

Elaija we chiri uwe - nwuda - ya, piakọta ya, tie miri ahu, ewe kera ya, otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ, ha abua we gabiga n'ala-akọrọ.


Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ: Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha: Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.


Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.


Umu Israel we ba n'etiti oké osimiri ahu n'elu ala-akọrọ ahu: miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha, na n'aka-ekpe-ha.


Ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri; miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha na n'aka-ekpe-ha.


O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean,


Okwukwe ka ha ji gabiga n'etiti oké osimiri Uhie dika ọ bu ala kpọrọ nku: ma elomiri ndi Ijipt mb͕e ha nwara igabiga ya.


O rue, mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan, na Jehova gwara Joshua okwu, si,


Ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ahu nēguzo kwa n'etiti Jọdan, rue mb͕e emezuru okwu ahu nile nke Jehova nyere Joshua n'iwu igwa ndi Israel, dika ihe ahu nile si di nke Moses nyere Joshua n'iwu: ndi Israel we me ngwa gabiga.


O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.


Unu gēme kwa ka umu-unu mara, si, N'ala-akọrọ ka Israel gabigara Jọdan nka.


nye-kwa-nu ha iwu, si, Bupuru onwe-unu n'ebe a, n'etiti Jọdan, n'ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà, nkume iri na abua, bubiga ha n'etiti unu, dọba ha n'ọnọdu-abali ahu, ebe unu gānọ abali ta.


O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan n'akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n'akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n'ihi umu Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan