Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 24:7 - Bible Nso

7 Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 24:7
14 Iomraidhean Croise  

Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova.


ọ we bata n'etiti ọmuma-ulo-ikwū Ijipt na ọmuma-ulo-ikwū Israel; igwe-oji ahu na ọchichiri ahu we di, ma ọ nēnye ìhè n'abali: otù abiarughi kwa nso ibe-ya n'abali ahu nile.


Israel we hu aka uku nke Jehova ji megide ndi Ijipt, ndi Israel we tua egwu Jehova, kwere na Jehova, na n'orù-Ya Moses.


Unu we biri na Kedesh ọtutu ubọchi, dika ubọchi nile si di nke unu biri n'ebe ahu.


Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.


Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Unu onwe-unu ahuwo ihe nile nke Jehova mere Fero, me kwa ndi-orù-ya nile, me kwa ala-ya nile, n'anya-unu n'ala Ijipt;


Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?


Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n'obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia?


N'ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n'ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n'Ijipt puta, n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan