Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 24:31 - Bible Nso

31 Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 24:31
13 Iomraidhean Croise  

Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu.


Joash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.


Josaia we si n'ala nile nke umu Israel nwere wezuga ihe-árú nile, me ndi nile ahuru n'Israel ka ha fè òfùfè, ọbuná ifè Jehova, bú Chineke-ha, òfùfè. Ubọchi-ya nile ha esighi n'iso Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, wezuga onwe-ha.


Mu onwem matara na mb͕e m'lasiri agu jọb͕uru onwe-ha gābà n'etiti unu, ghara imere ìgwè aturu ebere;


Ma unu amawo ta: n'ihi na ọ bughi umu-unu ka m'nāgwa okwu, bú ndi nāmaghi, ndi nāhughi kwa idọ-aka-na-nti nke Jehova, bú Chineke-unu, na idi-uku-Ya, na aka-Ya di ike, na ogwe-aka-Ya esetiri eseti,


ma ọ bu anya-unu nāhu omume uku nile nke Jehova, nke O meworo.


umu-ha, ndi nāmaghi, gānu kwa, we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ebe unu nāgabiga Jọdan inweta ya.


N'ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke m'nyeworo unu n'iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n'ihi na unu gēme ihe ọjọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe n'omume aka-unu.


Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku;


Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.


Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya, inweta ala ahu.


Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan