28 Joshua we zilaga ndi Israel, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.
28 Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.
Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n'obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.
Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu: n'ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa ebo nna-ya-hà.
Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu; n'ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa nke aka ya.
Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha.
Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu.
O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, nwuru, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri.
Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya, inweta ala ahu.