Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 24:20 - Bible Nso

20 Mb͕e unu gārapu Jehova, fè chi ala ọzọ òfùfè, Ọ gēchighari kwa mejọ unu, me ka unu gwusia, mb͕e O mesiri unu nma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 24:20
19 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, n'anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu.


Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.


o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.


N'ihi na emerem ihere iriọ n'aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n'ihi onye-iro nke di n'uzọ: n'ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n'aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.


Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ, Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;


Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n'otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia.


Ma ndi ahu nupuru isi, me ka o wuta Mọ Nsọ Ya: O we chigharia ghọrọ ha onye-iro, Ya onwe-ya busoro ha agha.


olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.


ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.


Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n'elu-igwe; dika edeworo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaram Ọ̀gu arọ abua n'ọhia, unu ulo Israel?


Mb͕e i gāmu umu, na umu umu, unu we nọ di anya n'ala ahu, duhie onwe-unu, me arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula, i we me ihe ọjọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, ikpasu Ya iwe:


emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.


Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu: Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.


Ndi Israel we si Joshua, É-è; kama Jehova ka ayi gēfè òfùfè.


ma ọ buru na unu egeghi nti olu Jehova, kama unu nānupu isi n'okwu-ọnu Jehova, aka Jehova gādi kwa imegide unu, otú ọ di imegide nna-unu-hà.


Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n'iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan