Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 24:16 - Bible Nso

16 Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 24:16
8 Iomraidhean Croise  

Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike, Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi.


Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?


Chineke ekwela. Ayi onwe-ayi, bú ndi nwuru n'ebe nmehie di, àyi gēsi aṅa nādi ndu ọzọ nime ya?


Ya buru ayi ihe-árú inupu isi n'okpuru Jehova, na isi n'iso Jehova chigharia ta, iwu ebe-ichu-àjà isure àjà-nsure-ọku, ma-ọbu inye onyinye-inata-iru-ọma, ma-ọbu ichu àjà, nāgughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, di n'íru ebe-obibi-Ya.


Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.


n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha:


Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m'mehie megide Jehova n'igha ikpe ekpere bayere unu: ma m'gēzí unu ihe n'uzọ ahu di nma nke ziri ezi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan