Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 24:11 - Bible Nso

11 Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M'we nye ha n'aka-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 24:11
25 Iomraidhean Croise  

ndi-Kinait, na ndi-Kenizait, na ndi-Kadmonait,


O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile; Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara:


Oké osimiri huru ya, we b͕alaga; Jọdan chighariri la azu.


Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ? Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu?


O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n'ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n'ọnwa nka.


N'ihi na mọ-ozim ganēje n'iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M'gēzopu kwa ha n'uwa.


M'gēziga kwa ebu n'iru gi, ha gāchupu ndi-Haivait, na ndi Kenean, na ndi Het, n'iru gi.


M'gētiye kwa ókè-ala-gi site n'Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n'ọzara rue Osimiri Yufretis: n'ihi na M'gēwere ndi bi n'ala ahu nye n'aka-unu; i gāchupu kwa ha n'iru gi.


M'we si, M'gēme ka unu si na nweda-n'ala nke Ijipt rigorue ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Perizait na ndi-Haivait na ndi Jebus, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya.


M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.


M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:


Mb͕e O wedasiri mba asa n'ala Kenean, O me ka ha keta ala-ha, ihe ra ka nnù arọ na ọgu arọ abua na iri:


Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n'iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid;


Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n'iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi;


Joshua we si, Nka ka unu gēji mata na Chineke Nke di ndu nọ n'etiti unu, Ọ ghaghi kwa inapu ha ala-ha n'iru unu, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Haivait, na ndi-Perizait, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Jebus.


O rue, mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan, na Jehova gwara Joshua okwu, si,


Ndi Israel we si na Jọdan rigota n'ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n'iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n'iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara:


na ha chikọtara onwe-ha, ibuso Joshua na ibuso Israel agha, n'otù ọnu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan