Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 24:1 - Bible Nso

1 Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 24:1
13 Iomraidhean Croise  

Abram we gabiga n'ala ahu rue ebe Shekem, rue osisi terebinth nke More. Ndi Kenean nọ n'ala ahu mb͕e ahu.


Ha we nye Jekob chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'aka-ha, na nb͕a-aka nile nke di na nti-ha; Jekob we zobe ha n'okpuru osisi terebinth nke di nso Shekem.


Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru, ime ya eze.


Eze we ziga, ha we chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem n'ebe ọ nọ.


Ya mere n'otù oge ahu ka m'zigara gi; gi onwe-gi me-kwa-ra nke-ọma na i biawo. Ya mere ub͕u a ayi onwe-ayi nile nọ n'ebe a n'iru Chineke, inu ihe nile nke Onye-nwe-ayi nyeworo gi n'iwu.


Debe-kwa-nu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha, ka unu we nwe uche n'ihe nile nke unu nēme.


Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n'ugwu Naftali, na Shekem n'ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n'ugwu Juda.


na Joshua kpọrọ Israel nile, bú ndi-okenye-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha, si ha, Mu onwem aghọwo agadi, ubọchi ndum nāgwu:


Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.


ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n'aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n'iru Jehova n'ebo nile unu, na n'usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan