Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 23:16 - Bible Nso

16 Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n'iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n'aru unu, unu gālapu kwa n'iyì ngwa ngwa n'ezi ala ahu nke O nyeworo unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 23:16
16 Iomraidhean Croise  

Jehova gētib͕u kwa Israel, dika amì nēme nkpatu nime miri; Ọ gēropu kwa Israel n'ezi ala nka, nke O nyere ndi bu nna-ha, Ọ gēfesa kwa ha n'ofè Osimiri; n'ihi na ha emewo Asherim-ha, nākpasu Jehova iwe.


Ma ọ buru na unu esi n'isom laghachi ma-ọli, unu onwe-unu ma-ọbu umu-unu, unu-we ghara idebe ihe nile M'nyere n'iwu na ukpurum nile nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:


M'gēbipu kwa Israel n'elu ala nka nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile:


O rue, n'ihi na umu Israel mehiere megide Jehova, bú Chineke-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt, si n'okpuru aka Fero, bú eze Ijipt, rigoputa, n'ihi na ha tu-kwa-ra egwu chi di iche iche ọzọ,


N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.


Emeruwo kwa uwa n'okpuru ndi bi ya; n'ihi na ha agabigawo iwu nile, b͕anwe ukpuru, mebie ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.


ha we bata, nweta ya; ma ha egeghi nti olu-Gi, ọ bu kwa n'iwu-Gi ka ha nējegharighi; n'ihe nile nke I nyere ha n'iwu ime ọ dighi nke ha meworo: I we me ka ihe ọjọ a nile dakwasi ha:


Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.


O gēru kwa, na dika M'chère ime ha, otú a ka M'gēme unu.


nke jewo-kwa-ra fè chi ọ bula ọzọ òfùfè, we kpọ isi ala nye ha, ma-ọbu inye anyanwu, ma-ọbu inye ọnwa, ma-ọbu inye ihe ọ bula nime usu ihe elu-igwe, nke m'nēnyeghi n'iwu;


Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru.


n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, ha we punara ha ihe, O renye kwa ha n'aka ndi-iro-ha gburugburu, ha apughi kwa iguzo n'iru ndi-iro-ha ọzọ.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel; O we si, N'ihi na mba nka agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyeworo ndi bu nna-ha n'iwu, n'ihi na ha egeghi kwa nti olum;


Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n'iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan