Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 23:14 - Bible Nso

14 Ma, le, mu onwem nēje n'uzọ uwa nile ta: ma unu amawo n'obi-unu nile na nime nkpuru-obi-unu nile, na ọ dighi otù ihe dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, kwuru bayere unu; ha nile emeworo unu, ọ dighi otù ihe dapuru nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 23:14
16 Iomraidhean Croise  

Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n'Ijipt:


Mu onwem nēje n'uzọ uwa nile: ma di ike, buru kwa nwoke;


Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n'okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n'aka Moses, bú orù-Ya.


N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.


M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.


ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.


Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?


Elu-igwe na uwa gāgabiga: ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;


Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n'ala sitere n'okwu-ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan