Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 22:9 - Bible Nso

9 Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we laghachi, si n'ebe umu Israel nọ site na Shailo, nke di n'ala Kenean, ga, ijeru ala Gilead, iru ala ihe-onwunwe-ha, nke ha nwere ihe-onwunwe nime ya, dika okwu-ọnu Jehova n'aka Moses si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 22:9
19 Iomraidhean Croise  

o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile.


ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead.


Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem.


Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;


Moses we si ha, Ọ buru na unu eme ihe a; ọ buru na unu ejikere onwe-unu n'iru Jehova ibu agha,


ewe buda ala ahu n'iru Jehova: emesi kwa unu gālata, we buru ndi ikpe nāmaghi site n'aka Jehova, site kwa n'aka Israel; ala nka ewe buru unu ihe-onwunwe n'iru Jehova.


Umu-ntakiri-ayi, na ndinyom-ayi, na anumanu-ayi, na anu-ulo-ayi nile, gānọ n'ebe ahu n'obodo nile nke Gilead:


Moses we si ha, Ọ buru na umu Gad na umu Reuben eso unu gabiga Jọdan, onye ọ bula nke ejikere ibu agha, n'iru Jehova, ewe buda ala ahu n'iru unu; unu gēnye kwa ha ala Gilead ahu, ibu ihe-onwunwe:


M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.


rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O mere unu, ha onwe-ha we nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha n'ofè Jọdan: unu we laghachi, nwoke ọ bula rue ihe-nnweta-ya, nke m'nyeworo unu.


Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n'iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan;


na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;


Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n'iru Raba;


nkera Gilead, na Ashtarot, na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan, we diri umu Makia nwa Manase, diri nkera umu Makia dika ab͕uru nile ha si di.


Ha we biarue buruburu-ala Jọdan, nke di n'ala Kenean, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu n'akuku Jọdan, bú ebe-ichu-àjà uku n'ile ya anya.


Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.


Gilead biri n'ofè Jọdan: Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o? Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri, Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan