Joshua 22:8 - Bible Nso8 gwa ha okwu, si, Werenu ọtutu àkù laghachi n'ulo-ikwū-unu, were kwa anu-ulo bara uba nke-uku, were kwa ọla-ọcha, were kwa ọla-edo, were kwa ọla, were ígwè, were kwa uwe bara uba nke-uku: soronu umu-nne-unu kere ihe-nkwata ndi-iro-unu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 “Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche. Faic an caibideil |