Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 22:6 - Bible Nso

6 Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 22:6
18 Iomraidhean Croise  

Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:


Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua.


Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero.


Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha.


O we kesara ndi Israel nile, bú ìgwè nile nke Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otú ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami. Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya.


Devid we lata igọzi ulo-yaz. Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, we puta izute Devid, si, Le, otú eze Israel di nsọpuru nke-uku ta, onye kpupuru uwe n'aru-ya ta n'anya ndi-orù-nwayi nke ndi-orù-ya, dika otù nime ndikom efu nēkpupu uwe n'aru-ya ekpupu!


N'ubọchi nke-asatọ o zilagara ndi Israel, ha we gọzie eze, la n'ulo-ikwū-ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nile nke Jehova mere Devid, bú orù-Ya, nke O me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.


N'ihi na ọtutu ndi Israel, bú ọtutu ndi sitere n'Efraim na Manase na Isaka na Zebulun, emeghi onwe-ha ka ha di ọcha, kama ha riri oriri ngabiga otú anēdeghi ya n'akwụkwọ. Ma Hezekaia kpere ekpere bayere ha, si, Ka Jehova, bú ezi Onye ahu, kpuchiere onye ọ bula nmehie-ya,


Moses we hu ojije-ozi ahu nile, ma, le, ha ejewo ya; dika Jehova nyere iwu, otú a ka ha jere ya: Moses we gọzie ha.


Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;


O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha.


Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa.


Joshua we zilaga ndi Israel, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.


Samuel we gwa ndi Israel ikpe ala-eze ahu, de kwa ya n'akwukwọ, dọba ya n'iru Jehova. Samuel we zilaga ndi Israel nile, nwoke ọ bula n'ulo-ya.


Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.


Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n'ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n'ebe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan