Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 22:24 - Bible Nso

24 ọ buru kwa na ayi emeghi nka site n'iche uche okwu, si, N'ọdi-n'iru umu-unu gāgwa umu-ayi okwu, si, Gini ka unu na Jehova, bú Chineke nke Israel, nwekọrọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “Ma nke ahụ abụghị ihe anyị bu nʼobi! Anyị wuru ya nʼihi na anyị tụrụ ụjọ na nʼoge dị nʼihu, ụmụ unu ga-agwa ụmụ anyị okwu sị, ‘Gịnị ka unu na Onyenwe anyị, Chineke Izrel nwekọrọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 22:24
7 Iomraidhean Croise  

N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.


Ezi omumem gāza-kwa-ram n'ọdi-n'iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n'iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n'etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n'etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n'akam.


O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta:


Mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi ihe-àmà ndia, na ukpuru ndia, na ikpé ndia, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyeworo unu n'iwu?


ka ayi wuworo onwe-ayi ebe-ichu-àjà isi n'iso Jehova chigharia; ọ buru kwa na ọ bu isure àjà-nsure-ọku ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma n'elu ya, ọ buru kwa na ọ bu ichu ihe àjà nke àjà-udo n'elu ya, ka Jehova Onwe-ya jua ase ya;


n'ihi na Jehova etiyewo ókè-ala n'etiti ayi na unu, umu Reuben na umu Gad, bú Jọdan; unu enweghi òkè nime Jehova: umu-unu ewe me ka umu-ayi kwusi n'itu egwu Jehova.


ka nka we buru ihe-iriba-ama n'etiti unu, mb͕e umu-unu gāju ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi nkume ndia n'ebe unu nọ?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan