Joshua 22:23 - Bible Nso23 ka ayi wuworo onwe-ayi ebe-ichu-àjà isi n'iso Jehova chigharia; ọ buru kwa na ọ bu isure àjà-nsure-ọku ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma n'elu ya, ọ buru kwa na ọ bu ichu ihe àjà nke àjà-udo n'elu ya, ka Jehova Onwe-ya jua ase ya; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a23 Ọ bụrụ na anyị sitere na nnupu isi wuo ebe ịchụ aja a maka ịchụ aja udo maọbụ aja mkpụrụ ọka, ka Onyenwe anyị nʼonwe ya taa anyị ahụhụ. Faic an caibideil |
ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova: