Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 22:20 - Bible Nso

20 Ekan nwa Zera, ọ̀ mekpughi ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova, ma n'aru nzukọ nile nke Israel ka iwe dikwasi? ma ọ bughi nání ya onwe-ya, bú otù onye, kubirì ume n'ajọ omume-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 22:20
11 Iomraidhean Croise  

Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n'ikpe-ọmuma-ha nka.


Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi; Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu.


Moses we si Eron, ọ si kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom, Unu akọpula agiri-isi-unu, unu adọwa-kwa-la uwe-unu; ka unu we ghara inwu, ka Ọ we ghara kwa iwe iwe megide nzukọ Israel nile: ma ka umu-nne-unu, bu ulo nile nke Israel, kwara nsure-ọku ahu nke Jehova sureworo akwá.


Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu.


Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we za, gwa ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel okwu, si,


Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.


o we me ka ulo-ya biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Ekan, nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda.


Joshua, ya na Israel nile, we were Ekan nwa Zera, na ọla-ọcha ahu, na uwe-nwuda ahu, na nkpirikpi ọla-edo ahu, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na ehi-ya, na inyinya-ibu-ya, na ìgwè ewu na aturu-ya, na ulo-ikwū-ya, na ihe nile o nwere: ha we me ka ha rigorue Ndagwurugwu Ekoa.


Ndikom Ai we tib͕ue ihe ra ka orú madu na iri na isi sitere na ha: ha we si n'iru ọnu-uzọ-ama chugide ha rue Shebarim, we tib͕ue ha na nrida ahu: obi we lọ ndi Israel miri, we ghọ miri miri.


O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan