Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 21:1 - Bible Nso

1 Ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai we biarue nso Eleeza, bú onye-nchu-àjà, biaru kwa nso Joshua nwa Nun, biaru kwa nso ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 21:1
9 Iomraidhean Croise  

Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel.


Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha: umu-ndikom Reuben, bú ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami: ndia bu ab͕uru Reuben.


Eleeza nwa Eron we lutara onwe-ya otù nime umu-ndinyom Putiel, ọ we muara ya Finehas. Ndia bu ndi-isi nke ndi bu nna nke ndi Livai, dika ab͕uru nile ha si di.


Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si,


Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n'ihe-onwunwe nke umu Israel, n'aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n'aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n'obodo-ya nile.


Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta;


Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.


Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan