Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 20:8 - Bible Nso

8 N'ofè Jọdan n'akuku Jeriko n'akuku ọwuwa-anyanwu ha nye-kwa-ra Beza n'ọzara n'ala di lari site n'ebo Reuben, na Remot nime Gilead site n'ebo Gad, na Golan nime Beshan site n'ebo Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 20:8
12 Iomraidhean Croise  

Eze Israel we chikọta ndi-amuma, ra ka nnù ndikom, ọ si ha, M'gēje imegide Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu m'gārapu? Ha we si, Rigo; Onye-nwe-ayi gēnye kwa ya n'aka eze.


O we soro Joram nwa Ehab ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram.


enye-kwa-ra ha n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu Jọdan, site n'ebo Reuben, Beza n'ọzara na ebe-ita-nri-ya nile, na Jahza na ebe-ita-nri-ya nile,


site kwa n'ebo Gad; Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile,


bú obodo nile nke ala ahu di lari, na Gilead nile, na Beshan nile, rue Saleka na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan.


bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase.


Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n'ugwu Naftali, na Shekem n'ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n'ugwu Juda.


Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n'etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu, ghara kwa onwu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọ Israel.


Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n'ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua.


Site kwa n'ebo Reuben, Beza na ebe-ita-nri-ya nile, na Jehaz na ebe-ita-nri-ya nile,


Site n'ebo Gad, Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan