Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:5 - Bible Nso

5 o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:5
11 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m'si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m'we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n'ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n'ubọchi-izu-ike.


Ọnu-uzọ-ama-gi nile gēghe kwa oghe mb͕e nile; agaghi-emechi ha n'ehihie ma-ọbu n'abali; ka madu we bubatara gi àkù nke mba di iche iche, ndi-eze-ha aburu kwa ndi anēdu edu.


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.


Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.


Nwanyi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha; o we si, Ọ bu otú a, ndikom ahu bakuterem, ma amaghm ebe ha si bia:


Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n'elu-ulo, o we zobe ha n'ókpòrò flax, nke edoro n'uso nye ya n'elu-ulo.


Ndikom ahu we nāchu ha n'uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ha we mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ndi nāchu ha n'azu pusiri.


Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n'ehihie ma-ọli (n'ihi na abali agaghi-adi n'ebe ahu):


Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid, ma Maikal siri, Aru adighi ya ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan