Joshua 2:5 - Bible Nso5 o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.” Faic an caibideil |
Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.