Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:3 - Bible Nso

3 Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Me ka ha puta, bú ndikom ahu ndi bakutere gi, ndi bara n'ulo-gi: n'ihi na ọ bu ileputa ala nka nile ka ha biaworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:3
15 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.


Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo:


Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, bú onye-nwe-ha, Devid, ọ́ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa obodo a, na iledo ya, na ikwatu ya, ka Devid zitere ndi-orù-ya ibiakute gi?


Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n'ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem.


Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi?


Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?


Me onye ahu nākọcha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ndi nile nke nuru olu-ya gēbikwasi aka-ha n'isi-ya, nzukọ nile gātub͕u ya na nkume.


Pailat we pu kwa ọzọ n'èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n'èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.


Mb͕e o jidesiri ya, ọ tubà ya n'ulo-nkpọrọ, we rara ya nye n'aka ndi-agha iri na isi iche ya anọ anọ; nēzube ikuputa ya nye ndi-Ju mb͕e ememe ngabiga gasiri.


Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ.


Ha we me otú a, me ka eze ise ahu si n'ọb͕à ahu pukute ya, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon.


Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a sitere n'umu Israel ileputa ala-ayi.


Nwanyi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha; o we si, Ọ bu otú a, ndikom ahu bakuterem, ma amaghm ebe ha si bia:


Sisera we si ya, Guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, o gēru kwa, ọ buru na nwoke ọ bula abia, jua gi, si, Ọ̀ di nwoke ọ bula nọ n'ebe a? na i gāsi, É-è.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan