Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:24 - Bible Nso

24 Ha we si Joshua, N'ezie Jehova enyewo ala ahu nile n'aka-ayi; ọzọ kwa, ndi nile ndi bi n'ala ahu nāb͕azepu n'iru ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:24
16 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri: Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha: Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.


M'gētiye kwa ókè-ala-gi site n'Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n'ọzara rue Osimiri Yufretis: n'ihi na M'gēwere ndi bi n'ala ahu nye n'aka-unu; i gāchupu kwa ha n'iru gi.


Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya; Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.


Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche.


Ndikom abua ahu we laghachi, si n'ugwu ahu rida, we gabiga, biakute Joshua nwa Nun; ha we kọrọ ya ihe nile nke dakwasiri ha.


O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan n'akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n'akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n'ihi umu Israel.


Jehova we si Joshua, Le, enyewom Jeriko, na eze-ya, na ndi-dike nile, bú dinkpà, n'aka-gi.


Jehova we si Joshua, Atula egwu, atu-kwa-la ujọ: chiri ndi-agha nile tiyere onwe-gi, bilie, rigorue Ai: le, enyewom eze Ai, na ndi-ya, na obodo-ya, na ala-ya, n'aka-gi:


Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya.


Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n'aka abua: n'ihi na Chineke enyewo ya n'aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n'uwa nakọ n'ebe ahu.


O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan