Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:10 - Bible Nso

10 N'ihi na ayi anuwo otú Jehova mere ka miri Oké Osimiri Uhie takọrọ n'iru unu, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na ihe unu mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan, bú Saihon na Og, ndi unu wezugara ka ebibie ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 nʼihi na anyị anụla otu Onyenwe anyị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:10
13 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi: Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.


Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi:


Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere


Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere: O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya, Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha, Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.


Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta.


M'we ziga ebu n'iru unu, nke chupuru ha n'iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n'uta-gi.


ka ndi nile nke uwa we mara aka Jehova, na ike ka ọ di; ka ha we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile.


O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan n'akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n'akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n'ihi umu Israel.


na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan