Ma ndia bu aha ebo nile: site na nsọtu Ugwu, n'akuku uzọ Hetlon rue nbata Hemat, Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, n'akuku Ugwu n'akuku Hemat; ọ gēnwe kwa akuku Iru-anyanwu na nke Ọdida-anyanwu; Dan, otù òkè.
Joshua we tib͕ue ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb, na ebe di ala ala, na nkpọrube nile, na eze-ha nile; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o wezuga ihe nile nēku ume ka ebibie ya, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere iwu.
Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: na mb͕e ahu ebo ndi Dan nāchọrọ onwe-ha ala-nketa ibiri ebiri; n'ihi na ọ dighi ala bara n'aka-ha n'ihe-nketa n'etiti ebo Israel nile rue ubọchi ahu.