Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 18:8 - Bible Nso

8 Ndikom ahu we bilie, je: Joshua we nye ndi nēje ide ala ahu n'akwukwọ iwu, si, Jenu, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ, laghachikutem, m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, nime Shailo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 18:8
13 Iomraidhean Croise  

Bilie, jegharia n'ala nka n'ogologo-ya na n'obosara-ya; n'ihi na gi ka M'gēnye ya.


Ya onwe-ya efewo-kwa-ra ha nzà, aka-Ya ewerewo kwa ya kère ha n'eriri-ọtùtù: rue mb͕e nile ka ha gēnweta ya, rue ọb͕ọ nile ka ha gēnwe ebe-obibi-ha nime ya.


Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.


Ma ub͕u a kère ebo iteghete na nkera ebo Manase ala nka n'ihe-nketa.


Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.


Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha.


Joshua we fere ha nzà nime Shailo n'iru Jehova: Joshua we kère umu Israel ala n'ebe ahu dika esi kè ha n'òkè n'òkè.


Unu onwe-unu gēde kwa ala ahu n'akwukwọ n'òkè asa, wetaram akwukwọ ahu n'ebe a: m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, bú Chineke-ayi.


Ndikom ahu we je, gabiga n'ala ahu, de ya n'akwukwọ dika obodo nile si di n'òkè asa, ha we biakute Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū nime Shailo.


Sọl we si Jehova, bú Chineke Israel, Nye nzà zuru okè. Nzà we ma Jonatan na Sọl: ma ndi Israel puru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan