Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 18:14 - Bible Nso

14 Ewe kpa ókè ahu, o we b͕a buruburu rue akuku Ọdida-anyanwu n'akuku Ndida, site n'ugwu nke di n'iru Bet-horon n'akuku Ndida; ọpupu-ya di kwa na Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), bú obodo umu Juda: nka bu akuku Ọdida-anyanwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 18:14
9 Iomraidhean Croise  

Devid we bilie, si na Beale Juda je, ya na ndi Israel nile ndi ya na ha nọ, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, nke akpọkwasiri Aha, bú aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha Onye nānọkwasi cherubim.


Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), na Raba; obodo abua na obodo ntà ha.


ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim):


Ókè-ala ahu we si n'ebe ahu gabiga rue Luz, rue akuku Luz (nke ahu bu Bet-el), n'akuku Ndida; ókè-ala ahu we rida rue Atarot-ada, n'elu ugwu nke di na Ndida nke Bet-horon di n'okpuru.


Akuku Ndida we site na nsọtu Kiriat-jearim, ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu, pua rue isi-iyi miri Neftoa:


Umu Israel we bilie ije, biarue obodo nile ha n'ubọchi nke-atọ. Ma obodo-ha bu Gibeon, na Kefira, na Beirot, na Kiriat-jearim.


otù usu we che iru n'uzọ Bet-horon: otù usu we che iru n'uzọ ókè-ala nke nēlekwasi ndagwurugwu Zeboim anya, n'ebe ọzara di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan