Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 17:18 - Bible Nso

18 n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 nʼihi na ala ugwu ugwu oke ọhịa ahụ bụkwa nke unu. Sụchaanụ ya, ruo na nsọtụ ya, ka ọ bụrụ nke unu. Ọ bụ ezie na ndị Kenan bi nʼime ya nwere ụgbọ agha igwe, bụrụkwa ndị sịrị ike, unu nwere ike ịchụpụ ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 17:18
18 Iomraidhean Croise  

Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike, Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume, Site n'aka Dike nke Jekob, (N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)


Ndi-ya we pua je n'ọhia izute Israel: agha ahu we di n'oké ohia Efraim.


Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?


É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.


Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.


Ya mere ayi were obi-ike si, Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka; Gini ka madu gēmem?


ndi nile bi n'ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n'iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n'ihe-nketa, dika M'nyeworo gi iwu.


ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim):


Joshua we gwa ulo Josef, bú Efraim na Manase, okwu, si, Ndi bara uba ka i bu, ọ bu kwa ike uku ka i nwere: i gaghi-enwe nání otù ihe-ife-nzà:


Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n'ugwu Naftali, na Shekem n'ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n'ugwu Juda.


Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan