Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 15:8 - Bible Nso

8 ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 15:8
17 Iomraidhean Croise  

Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.


Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.


O meru-kwa-ra Tofet, nke di na ndagwurugwu umu Hinom, ka nwoke ọ bula we ghara ime ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku rue Molek.


Devid na Israel nile we jerue Jerusalem (nke ahu bu Jebus); ma n'ebe ahu ka ndi Jebus, ndi bi n'ala ahu, nọ.


Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n'ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


na Zanoa, na Adulam, na obodo ntà ha, na Lekish na ọhia-ya nile, na Azeka na umu-obodo-ya. Ha we ma ulo-ikwū-ha site na Bia-sheba rue ndagwurugwu Hinom.


Ọ gādi kwa ka mb͕e onye nēwe ihe ubi nēkpokọta ọka guzo ọtọ, ogwe-aka-ya anēwe oko ọka; ọ gādi kwa ka mb͕e anāchikọta oko ọka dara ada na ndagwurugwu Refaim.


Jeremaia we si na Tofet bia, ebe Jehova zigara ya ibu amuma; o we guzo n'ogige ulo Jehova, si ndi Israel nile:


purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n'ebe ahu okwu nile nke M'gāgwa gi:


n'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u.


Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.


ókè-ala ahu we rida rue nsọtu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu nwa Hinom, nke di na ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu; ọ rida rue ndagwurugwu Hinom, rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida, we rida rue En-rogel;


na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.


Ma umu Benjamin anapughi ndi Jebus ndi bi na Jerusalem ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Benjamin nime Jerusalem, rue ta.


Umu Juda we buso Jerusalem agha, were ya, were ọnu nma-agha tib͕ue ya, su obodo ahu ọku.


Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan