Nwunye-ya, bú Hajehudija, we mua Jered nna Gedoa, na Heba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa. Ndia bu kwa umu-ndikom Bitia, bú nwa-nwayi Fero, nke Mered luru na nwunye.
O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.
Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia.
Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n'aka ndi Kenean nile ndi bi n'ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel.