Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 15:4 - Bible Nso

4 o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 15:4
8 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis:


Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ.


M'gētiye kwa ókè-ala-gi site n'Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n'ọzara rue Osimiri Yufretis: n'ihi na M'gēwere ndi bi n'ala ahu nye n'aka-unu; i gāchupu kwa ha n'iru gi.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gētichapu nkpuru-ọka-Ya, site na miri nērù ọku ọku nke Osimiri rue miri-iyi Ijipt, ewe chikọta unu onwe-unu n'otù n'otù, unu umu Israel.


ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.


site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa,


o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:


Ashdod, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; Geza, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; rue miri-iyi Ijipt, na oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan