Hezekaia, bú eze Juda, we zigara eze Asiria ozi rue Lekish, si, Emehiewom; si n'ebe m'nọ laghachi: ihe i gēbom m'gēburu ya. Eze Asiria we tukwasi Hezekaia, bú eze Juda, ọgu talent ọla-ọcha iri-na-ise na orú talent ọla-edo na iri.
Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, nke di n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.