Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu.
O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,