Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 14:9 - Bible Nso

9 Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 14:9
8 Iomraidhean Croise  

N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.


Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n'ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n'Ijipt.)


ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M'gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M'gēnye kwa umu-ya: n'ihi na o sozuwo Jehova n'azu


Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu.


Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi, unu ka M'nyeworo ya, dika M'gwara Moses okwu.


Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m'di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n'ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta.


Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan