Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n'ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.
n'ihi nka, le, M'gaje imeghe akuku Moab site n'obodo ahu nile, site n'obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim,