Heshbon nēti kwa nkpu, ya na Eleale: rue Jehaz ka anānu olu-ha: n'ihi nka ndi ejikere ibu agha nke Moab nētisi nkpu ike; nkpuru-obi-ya nāma jijiji nime ya.
Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu.