Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 13:17 - Bible Nso

17 Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 ruo Heshbọn, na obodo ndị ọzọ dị nʼala larịị ahụ, tinyere obodo Dibọn, na Bamot Baal, na Bet-Baal-Meon,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 13:17
17 Iomraidhean Croise  

na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon:


Ma n'obodo ntà nle n'ọhia-ha, ufọdu nime umu Juda biri na Kiriat-aba na umu-obodo-ya, na nime Dibon na umu-obodo-ya, na nime Jekabzeel na obodo ntà ya;


Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n'akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n'ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike.


Ikpé abiaruwo kwa ala nke bu ala di lari; rue Holon, ru kwa Jahza, ọ biakwasiwo kwa Mefaat;


biakwasi kwa Kiriataim, biakwasi kwa Bet-gamul, biakwasi kwa Bet-meon;


Onye nāpunara madu ihe gābiaru kwa obodo nile ọ bula, ọ dighi kwa obodo ọ bula gēwepuga onwe-ya; ndagwurugwu gāla kwa n'iyì, agēme kwa ka ala di lari tọb͕ọrọ n'efu; dika Jehova siri.


n'ihi nka, le, M'gaje imeghe akuku Moab site n'obodo ahu nile, site n'obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim,


si na Matana jerue Nahaliel: si na Nahaliel jerue Bamot:


N'ihi na Heshbon ahu, obodo Saihon, bú eze ndi-Amorait, ka ọ bu, eze ahu buso-kwa-rari eze gara aga Nke Moab agha, we nara ala-ya nile n'aka-ya, rue Anon.


Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon, Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa, Nke diruru Medeba.


O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.


na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.


Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba;


na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;


N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha.


N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha.


Mb͕e Israel biri na Heshbon na n'umu-obodo-ya, na n'Aroea na n'umu-obodo-ya, na n'obodo nile nke di n'akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n'aka-ha na mb͕e ahu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan