Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n'akuku Zaretan, n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam:
Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n'iteghari-egwú-ọṅù na n'iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi.
Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya), n'ezie dika Teboa n'etiti ugwu nile, na dika Kamel n'akuku oké osimiri, otú a ka ọ gābia.
Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ.
Ma otù nwoke bi na Maon, nke ọlu ọ nālu di na Kamel; nwoke ahu di kwa nọ̄ uku, ọ nwe-kwa-ra nnù aturu asa na ọgu iri, na nnù ewu abua na ọgu iri: ọ we nọ n'ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya na Kamel.